1
Jọn 17:17
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu.
Параўнаць
Даследуйце Jọn 17:17
2
Jọn 17:3
Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa.
Даследуйце Jọn 17:3
3
Jọn 17:20-21
“Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha. Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m.
Даследуйце Jọn 17:20-21
4
Jọn 17:15
Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ.
Даследуйце Jọn 17:15
5
Jọn 17:22-23
Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu; Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya.
Даследуйце Jọn 17:22-23
Стужка
Біблія
Планы чытання
Відэа