1
1 Samuel 2:2
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
“O nweghị onye dị nsọ dịka ONYENWE ANYị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
Compare
Explore 1 Samuel 2:2
2
1 Samuel 2:8
Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke ONYENWE ANYị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
Explore 1 Samuel 2:8
3
1 Samuel 2:9
Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
Explore 1 Samuel 2:9
4
1 Samuel 2:7
ONYENWE ANYị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
Explore 1 Samuel 2:7
5
1 Samuel 2:6
“ONYENWE ANYị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.
Explore 1 Samuel 2:6
Home
Bible
Plans
Videos