1
2 Ihe E Mere 20:15
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ọ sịrị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda niile na ndị bi na Jerusalem, na gị eze Jehoshafat. Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị na-asị unu. ‘Unu atụla ụjọ, maọbụ daa mba, nʼihi usuu ndị agha a niile dị unu nʼihu. Ọ bụghị unu ka agha a dịịrị, kama ọ bụ Chineke nwe ya.
Compare
Explore 2 Ihe E Mere 20:15
2
2 Ihe E Mere 20:17
Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, ONYENWE ANYị ga-anọnyekwara unu.’ ”
Explore 2 Ihe E Mere 20:17
3
2 Ihe E Mere 20:12
O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.”
Explore 2 Ihe E Mere 20:12
4
2 Ihe E Mere 20:21
Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too ONYENWE ANYị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ ONYENWE ANYị ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”
Explore 2 Ihe E Mere 20:21
5
2 Ihe E Mere 20:22
Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, ONYENWE ANYị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.
Explore 2 Ihe E Mere 20:22
6
2 Ihe E Mere 20:3
Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka ONYENWE ANYị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
Explore 2 Ihe E Mere 20:3
7
2 Ihe E Mere 20:9
‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’
Explore 2 Ihe E Mere 20:9
8
2 Ihe E Mere 20:16
Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel.
Explore 2 Ihe E Mere 20:16
9
2 Ihe E Mere 20:4
Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka ONYENWE ANYị; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu ONYENWE ANYị.
Explore 2 Ihe E Mere 20:4
Home
Bible
Plans
Videos