“ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu,
“Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla,
unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.”
Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ;
ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe,
ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ.
Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,
jirikwa ntị ha nụ ihe
sitekwa nʼobi ha nwe nghọta
ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’