1
Diuteronomi 7:9
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Matanụ nke ọma na ONYENWE ANYị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
Compare
Explore Diuteronomi 7:9
2
Diuteronomi 7:6
Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye ONYENWE ANYị bụ Chineke unu. ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.
Explore Diuteronomi 7:6
3
Diuteronomi 7:8
Kama, ọ bụ nʼihi ONYENWE ANYị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt.
Explore Diuteronomi 7:8
4
Diuteronomi 7:7
Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka ONYENWE ANYị ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ.
Explore Diuteronomi 7:7
5
Diuteronomi 7:14
A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.
Explore Diuteronomi 7:14
Home
Bible
Plans
Videos