1
Ọpụpụ 19:5-6
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”
Compare
Explore Ọpụpụ 19:5-6
2
Ọpụpụ 19:4
‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m.
Explore Ọpụpụ 19:4
Home
Bible
Plans
Videos