Ma ebube nke Chineke Izrel sitere nʼelu cherubim ndị ahụ, ebe ọ nọ na mbụ, bilie bịa guzokwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị kpọrọ nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha bụ onye nya akpa ahụ nke ihe e ji ede ihe dị nʼime ya, ọ sịrị ya, “Bilie, jegharịa nʼokporoụzọ niile nke obodo Jerusalem, kakwasị akara nʼegedege ihu ndị niile na-akwa akwa na ndị niile na-asụ ude nʼihi ihe arụ niile nke a na-eme nʼime ya.”