1
Jenesis 22:14
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “ONYENWE ANYị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu ONYENWE ANYị, a ga-arọpụta.”
Compare
Explore Jenesis 22:14
2
Jenesis 22:2
Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.”
Explore Jenesis 22:2
3
Jenesis 22:12
Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.”
Explore Jenesis 22:12
4
Jenesis 22:8
Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.
Explore Jenesis 22:8
5
Jenesis 22:17-18
aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”
Explore Jenesis 22:17-18
6
Jenesis 22:1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.”
Explore Jenesis 22:1
7
Jenesis 22:11
Ma mmụọ ozi ONYENWE ANYị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.”
Explore Jenesis 22:11
8
Jenesis 22:15-16
Mmụọ ozi ONYENWE ANYị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ, sị, “Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja
Explore Jenesis 22:15-16
9
Jenesis 22:9
Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.
Explore Jenesis 22:9
Home
Bible
Plans
Videos