Ọ nọchiri akụkụ Jọdan dị ndị agha Ifrem nʼazụ, ebe ndị agha Ifrem nwere ike isi gbapụ. Mgbe ọbụla onye agha Ifrem ọbụla gbapụrụ ọsọ chọọ ịgafe osimiri ahụ, ndị agha Gilead ga-ejide ya jụọ ya sị, “Ị bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya abụghị onye Ifrem, ha sịrị, “Ọ dị mma, kpọọ, ‘Shibolet.’ ” Ọ bụrụ na onye ahụ akpọ, “Sibolet,” nʼihi na ọ kpọpụtaghị mkpụrụ okwu ahụ nke ọma, ha na-akpụrụ ya gbuo ya na ngabiga mmiri Jọdan. Ọ bụ ọnụọgụgụ iri puku anọ, na puku abụọ ndị Ifrem ka e gburu mgbe ahụ.