“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta.
Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume,
bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị,
ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.