1
Ilu 17:17
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
Compare
Explore Ilu 17:17
2
Ilu 17:22
Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
Explore Ilu 17:22
3
Ilu 17:9
Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
Explore Ilu 17:9
4
Ilu 17:27
Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.
Explore Ilu 17:27
5
Ilu 17:28
A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.
Explore Ilu 17:28
6
Ilu 17:1
Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
Explore Ilu 17:1
7
Ilu 17:14
Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
Explore Ilu 17:14
8
Ilu 17:15
Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, ONYENWE ANYị na-akpọ omume abụọ a asị.
Explore Ilu 17:15
Home
Bible
Plans
Videos