1
Abụ Ọma 14:1
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
Compare
Explore Abụ Ọma 14:1
2
Abụ Ọma 14:2
ONYENWE ANYị sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke.
Explore Abụ Ọma 14:2
3
Abụ Ọma 14:3
Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.
Explore Abụ Ọma 14:3
Home
Bible
Plans
Videos