1
Abụ Ọma 51:10
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Compare
Explore Abụ Ọma 51:10
2
Abụ Ọma 51:12
Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
Explore Abụ Ọma 51:12
3
Abụ Ọma 51:11
Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
Explore Abụ Ọma 51:11
4
Abụ Ọma 51:17
Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
Explore Abụ Ọma 51:17
5
Abụ Ọma 51:1-2
O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.
Explore Abụ Ọma 51:1-2
6
Abụ Ọma 51:7
Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
Explore Abụ Ọma 51:7
7
Abụ Ọma 51:4
Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
Explore Abụ Ọma 51:4
Home
Bible
Plans
Videos