1
Ndị Rom 7:25
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.
Compare
Explore Ndị Rom 7:25
2
Ndị Rom 7:18
O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.
Explore Ndị Rom 7:18
3
Ndị Rom 7:19
Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme.
Explore Ndị Rom 7:19
4
Ndị Rom 7:20
Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha.
Explore Ndị Rom 7:20
5
Ndị Rom 7:21-22
Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime. Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru.
Explore Ndị Rom 7:21-22
6
Ndị Rom 7:16
Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma.
Explore Ndị Rom 7:16
Home
Bible
Plans
Videos