1
I. JỌN 4:18
Bible Nso
Egwu adighi n'ihu-n'anya: kama ihu-n'anya nke zuru okè nāchupu egwu n'èzí, n'ihi na egwu, akēmeghi ya ka o zue òkè nime ihunanya
Compare
Explore I. JỌN 4:18
2
I. JỌN 4:4
Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku.
Explore I. JỌN 4:4
3
I. JỌN 4:19
Ayi onwe-ayi nāhu n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya buru uzọ hu ayi n'anya.
Explore I. JỌN 4:19
4
I. JỌN 4:7
Ndi m'huru n'anya, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: n'ihi na ihu-n'anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n'anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke.
Explore I. JỌN 4:7
5
I. JỌN 4:8
Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya.
Explore I. JỌN 4:8
6
I. JỌN 4:10
Nime nka ka ihu-n'anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n'anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n'anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.
Explore I. JỌN 4:10
7
I. JỌN 4:11
Ndi m'huru n'anya, ọ buru na Chineke huru ayi n'anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n'anya.
Explore I. JỌN 4:11
8
I. JỌN 4:9
Nime nka ka emere ka ihu-n'anya Chineke puta ìhè nime ayi, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ muru nání Ya zite n'uwa, ka ayi we di ndu site n'aka-Ya.
Explore I. JỌN 4:9
9
I. JỌN 4:20
Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n'anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n'ihi na onye nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya, bú onye ọ huworo, ọ pughi ihu Chineke n'anya, bú Onye ọ nāhughi mb͕e ọ bula.
Explore I. JỌN 4:20
10
I. JỌN 4:15
Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke.
Explore I. JỌN 4:15
11
I. JỌN 4:21
Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.
Explore I. JỌN 4:21
12
I. JỌN 4:1-2
Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa. Nime nka ka unu mara Mọ nke Chineke: mọ ọ bula nke nēkwuputa na Jisus Kraist abiawo n'anu-aru bu mọ nke siri na Chineke puta
Explore I. JỌN 4:1-2
13
I. JỌN 4:3
ma mọ ọ bula nke nādighi-ekwuputa Jisus, o sighi na Chineke puta: nka bu kwa mọ nke onye ahu nēmegide Kraist, nke unu nuworo na ọ nābia; ọ bu kwa n'oge di ub͕u a ka ọ nọ n'uwa.
Explore I. JỌN 4:3
Home
Bible
Plans
Videos