1
I. SAMUEL 17:45
Bible Nso
Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta.
Compare
Explore I. SAMUEL 17:45
2
I. SAMUEL 17:47
ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi.
Explore I. SAMUEL 17:47
3
I. SAMUEL 17:37
Devid we si, Jehova nke naputaram n'aka ọdum, na n'aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n'aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi.
Explore I. SAMUEL 17:37
4
I. SAMUEL 17:46
Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel
Explore I. SAMUEL 17:46
5
I. SAMUEL 17:40
O were nkpa-n'aka-ya n'aka-ya, rọputara onwe-ya nkume ise kwọrọ murumuru na miri-iyi, tiye ha n'ihe ndi-ọzùzù-aturu nke o nwere, bú n'àkpà-ya; èbè-ya di kwa n'aka-ya: o we biarue nso onye Filistia ahu.
Explore I. SAMUEL 17:40
6
I. SAMUEL 17:32
Devid we si Sọl, Ka obi madu ọ bula ghara ifepu n'ihi ya; orù-gi gēje luso onye Filistia nka ọ̀gù.
Explore I. SAMUEL 17:32
Home
Bible
Plans
Videos