1
EKLISIASTIS 2:26
Bible Nso
N'ihi na ọ bu madu nke di nma n'iru Ya ka Chineke nyeworo amam-ihe, na ihe-ọmuma, na ọṅù: ma ọ bu onye-nmehie ka O nyeworo nweda-n'ala, ichikọta na ikpokọta, ka o we nye onye di nma n'iru Chineke ihe. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
Compare
Explore EKLISIASTIS 2:26
2
EKLISIASTIS 2:24-25
Ọ dighi ezi ihe di nime madu nke nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ka nkpuru-obi-ya hu ezi ihe nime ndọb͕u nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu. Nka ka mu onwem hu-kwa-ra, na ọ bu n'aka Chineke ka o sitere. N'ihi na ònye nēri ihe, ma-ọbu ònye nēme ngwa iri ihe karim?
Explore EKLISIASTIS 2:24-25
3
EKLISIASTIS 2:11
Mu onwem we che ọlum nile nke akam abua luru iru, eche-kwa-ram ndọb͕u nke m'dọb͕uru onwem n'ọlu ime iru: ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe, ọ dighi kwa ihe fọduru madu n'okpuru anyanwu.
Explore EKLISIASTIS 2:11
4
EKLISIASTIS 2:10
Ma ihe ọ bula anyam abua riọrọ, anapughm ha ihe ahu: eb͕ochighm obim n'ọǹù ọ bula, n'ihi na obim ṅuriri ọṅu site na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu; nka bu kwa òkèm nke sitere na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu.
Explore EKLISIASTIS 2:10
5
EKLISIASTIS 2:13
Mu onwem we hu na amam-ihe kariri nzuzu, dika ìhè si kari ọchichiri.
Explore EKLISIASTIS 2:13
6
EKLISIASTIS 2:14
Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile.
Explore EKLISIASTIS 2:14
7
EKLISIASTIS 2:21
N'ihi na madu di nke ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu di n'amam-ihe, na n'ihe-ọmuma, na n'izi-ezi; ma ọ bu madu nke nādọb͕ughi onwe-ya n'ọlu nime ya ka ọ gēnye ya ka ọ buru òkè-ya. Nka bu kwa ihe-efu na ihe ọjọ nke riri nne.
Explore EKLISIASTIS 2:21
Home
Bible
Plans
Videos