Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike,
Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume,
Site n'aka Dike nke Jekob,
(N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)
Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka!
Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi!
Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu,
Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru,
Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.