1
AISAIA 6:8
Bible Nso
M'we nu olu Onye-nwe-ayi, ka ọ nāsi, Ònye ka M'gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi? M'we si, Lem; zigam.
Compare
Explore AISAIA 6:8
2
AISAIA 6:3
Otù we kpọ ibe-ya òkù, si, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya.
Explore AISAIA 6:3
3
AISAIA 6:5
M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.
Explore AISAIA 6:5
4
AISAIA 6:1
N'arọ nke ọnwu eze, bú Uzaia, m'we hu Onye-nwe-ayi ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze di elu nke ebuliwo-kwa-ra elu, ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-Ya juputa-kwa-ra ulo uku Chineke.
Explore AISAIA 6:1
5
AISAIA 6:7
o we were ya metu ọnum, si, Le, nka emetuwo eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua; ewe wezuga ajọ omume-gi, kpuchi kwa nmehie-gi.
Explore AISAIA 6:7
6
AISAIA 6:2
Ndi-seraph nēguzo n'elu ya: nkù isi nkù isi ka seraph ọ bula nime ha nwere; abua ka o ji ekpuchi iru-ya, abua ka o ji ekpuchi ukwu-ya abua, abua ka o ji efe efe.
Explore AISAIA 6:2
7
AISAIA 6:6
Otù nime ndi-seraph we fekutem, jide otù nkume di ọku n'aka-ya, nke o ji nkpa weputa n'elu ebe-ichu-àjà
Explore AISAIA 6:6
8
AISAIA 6:9
O we si, Je, si ndi nka, Nānunu, ma unu aghọtala; nāhunu, ma unu amatala.
Explore AISAIA 6:9
9
AISAIA 6:10
Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike.
Explore AISAIA 6:10
Home
Bible
Plans
Videos