1
JEREMAIA 5:22
Bible Nso
ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.
Compare
Explore JEREMAIA 5:22
2
JEREMAIA 5:1
Jegharianu n'èzí nile nke Jerusalem, biko, hunu, we mara, chọ-kwa-nu n'amá-ya nile, ma ọ buru na unu gāchọta nwoke ọ bula, ọ buru na ọ di onye nēme ihe ekpere n'ikpé, onye nāchọ ikwesi-ntukwasi-obi; M'gāb͕aghara kwa obodo a.
Explore JEREMAIA 5:1
3
JEREMAIA 5:31
ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?
Explore JEREMAIA 5:31
Home
Bible
Plans
Videos