Na nrọ, bú ọhù nke abali,
Mb͕e oké ura nādakwasi madu,
N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;
Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,
Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,
Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,
Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;
Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,
Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.