1
MAK 9:23
Bible Nso
Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.
Compare
Explore MAK 9:23
2
MAK 9:24
Ngwa ngwa nna nwatakiri ahu tiri nkpu, si, Ekwem; nyere ekweghi-ekwem aka.
Explore MAK 9:24
3
MAK 9:28-29
Mb͕e Ọ batara n'ulo-ha, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya iche, si, Gini mere ayi onwe-ayi apughi ichupu mọ ahu? O we si ha, Aha mọ nka apughi iputa site n'ihe ọ bula, ma-ọbughi site n'ekpere.
Explore MAK 9:28-29
4
MAK 9:50
Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.
Explore MAK 9:50
5
MAK 9:37
Onye ọ bula nke gānara otù nime umu-ntakiri di otú a n'aham nke-ọma, ọ bu Mu onwem ka Ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma, ọ bughi Mu ka ọ nānara nke-ọma, kama ọ bu Onye ziterem.
Explore MAK 9:37
6
MAK 9:41
N'ihi na onye ọ bula nke gēkuru otù iko miri nye unu ṅua, n'ihi na unu bu ndi nke Kraist, n'ezie asim unu, na ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.
Explore MAK 9:41
7
MAK 9:42
Ọzọ, onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwerenu ka ọ ma n'ọnyà, ọ gāka ya nma ma ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, tubà ya n'oké osimiri.
Explore MAK 9:42
8
MAK 9:47
Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n'ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ
Explore MAK 9:47
Home
Bible
Plans
Videos