1
ABÙ ỌMA 103:2
Bible Nso
Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi
Compare
Explore ABÙ ỌMA 103:2
2
ABÙ ỌMA 103:3-5
Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche: Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.
Explore ABÙ ỌMA 103:3-5
3
ABÙ ỌMA 103:1
Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.
Explore ABÙ ỌMA 103:1
4
ABÙ ỌMA 103:13
Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.
Explore ABÙ ỌMA 103:13
5
ABÙ ỌMA 103:12
Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.
Explore ABÙ ỌMA 103:12
6
ABÙ ỌMA 103:8
Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere.
Explore ABÙ ỌMA 103:8
7
ABÙ ỌMA 103:10-11
Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya.
Explore ABÙ ỌMA 103:10-11
8
ABÙ ỌMA 103:19
Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe; Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.
Explore ABÙ ỌMA 103:19
Home
Bible
Plans
Videos