YouVersion Logo
Search Icon

1 Samuel Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Akwụkwọ Samuel nke mbụ na nke abụọ bụ otu akwụkwọ, nʼihi na ọ bụ akwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge Samuel, na Sọl, na Devid. E kewara ha ụzọ abụọ ime ka ha dị mfe ịgụ agụ. E ji akụkọ mkpagbu nke ndị Filistia na-akpagbu ndị Izrel malite akwụkwọ Samuel nke mbụ. Emesịa, a kọrọ akụkọ gbasara Samuel onye amụma, na Sọl eze mbụ nke ndị Izrel. A kọrọ akụkọ gbasara agha niile Sọl buru, na mmeri niile o meriri ndị iro ya. A kọkwara akụkọ banyere nnupu isi Sọl, na otu o si nwụọ. Nʼikpeazụ a kọrọ akụkọ banyere nhọpụta a họpụtara Devid ịbụ eze ndị Izrel.
Usoro e si dee ya:
Mmalite ọrụ Samuel na ibu agha ndị Filistia 1–7
Agha Sọl lụrụ na mmeri ya 8–15
Ọjụjụ Chineke jụrụ Sọl na nhọpụta Devid 16–20
Sọl akpagbuo Devid 21–24
Ịdị ukwuu nke Devid na ọnwụ Sọl 25–31

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in