YouVersion Logo
Search Icon

Esta 10

10
Ịdị ukwuu nke Mọdekai
1Eze bụ Ahasuerọs na-anakọta ụtụ site nʼaka ndị niile bi nʼalaeze ya tutu ruo nʼọnụ mmiri osimiri ebe alaeze ahụ sọtụrụ. 2Ma ọrụ ukwu na ọrụ niile ọ rụrụ, ya na ihe niile gbasara ịdị ukwuu nke Mọdekai, na ugwu niile eze nyere ya, ha niile ka e dere nʼime akwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Midia na Peshịa mere nʼoge ọchịchị ha. 3Mọdekai, onye Juu, bụ onye na-esote eze Ahasuerọs nʼọkwa. Ọ bụ onye dị ukwuu nʼetiti ndị Juu, na onye ndị Juu ibe ya na-asọpụkwara, nʼihi na ọ na-elenye anya nʼihe gbasara udo ndị Juu. Ọ bụkwa onye na-ekwuchite ọnụ nʼihe banyere ọdịmma nke ndị Juu niile.

Currently Selected:

Esta 10: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in