YouVersion Logo
Search Icon

Esta 9:20-22

Esta 9:20-22 BIU

Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya, ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla. Nke a bụ iji gosi mgbe ndị Juu nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche.