YouVersion Logo
Search Icon

Ọpụpụ 11:5-6

Ọpụpụ 11:5-6 BIU

Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ. Mgbe nke a mere, iti mkpu akwa dị ukwuu ga-adị nʼala Ijipt, ụdị ga-ada nʼala Ijipt niile nke na-adịbeghị nʼala Ijipt, ụdị iti mkpu akwa nke na-agaghị adịkwa ọzọ.