YouVersion Logo
Search Icon

Ọpụpụ 9:18-19

Ọpụpụ 9:18-19 BIU

Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a. Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’ ”