YouVersion Logo
Search Icon

Ezra 1:2-3

Ezra 1:2-3 BIU

“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘ONYENWE ANYị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.