YouVersion Logo
Search Icon

Jenesis 28:20-22

Jenesis 28:20-22 BIU

Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi, m lọghachi nʼụlọ nna m nʼudo, mgbe ahụ, ONYENWE ANYị ga-abụ Chineke m. Nkume a m doziri elu dịka ogidi ga-abụ ụlọ Chineke. Aga m eke ihe niile i nyere m ụzọ iri, nyeghachi gị otu ụzọ.”