YouVersion Logo
Search Icon

Aịzaya 56:6-7

Aịzaya 56:6-7 BIU

Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru ONYENWE ANYị ijere ya ozi, na ịhụ aha ONYENWE ANYị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike, ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”

Video for Aịzaya 56:6-7