YouVersion Logo
Search Icon

Job 1:20-22

Job 1:20-22 BIU

Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. ONYENWE ANYị nyere ihe niile, ONYENWE ANYị ewerekwala ihe niile, ka aha ONYENWE ANYị bụrụ ihe a gọziri agọzi.” Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.

Related Videos