YouVersion Logo
Search Icon

Joshua 4:21-23

Joshua 4:21-23 BIU

Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’ Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’ Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. ONYENWE ANYị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.