YouVersion Logo
Search Icon

Nehemaya 13:1-2

Nehemaya 13:1-2 BIU

Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke. Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)

Video for Nehemaya 13:1-2