YouVersion Logo
Search Icon

Nehemaya Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Akwụkwọ Nehemaya gakwara nʼihu ịkọ akụkọ ọnọdụ ndị Juda si Babilọn lọta nke akwụkwọ Ezra malitere. Ọkpụrụkpụ okwu pụtara ihe nʼakwụkwọ Ezra bụ mwugharị e wugharịrị ụlọnsọ ukwu, ma ọkpụrụkpụ okwu pụtara ihe nʼakwụkwọ Nehemaya bụ mwugharị e wugharịrị mgbidi gbara obodo Jerusalem gburugburu. A malitere akwụkwọ a site nʼịkọwa mkpa ọ dị iwugharị mgbidi ahụ, mesịa kọwaa otu e si wuo ya, na nsogbu niile dapụtara mgbe ha na-ewu ya. A kọrọ akụkọ otu e si doo otu ụbọchị iche maka ndị Juda niile ikwupụta mmehie ha, na otu e si mesịa wuchaa mgbidi ahụ.
Usoro e si dee ya:
Nlọta Nehemaya na Jerusalem 1–2
Mmalite ọrụ iwugharị mgbidi 3–7
Ngụpụta iwu Chineke na nkwupụta mmehie 8–10
Ido mgbidi ahụ nsọ 11–13

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in