YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 11

11
Abụ Ọma 11
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.
Onyenwe anyị ebe mgbaba
1Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.
Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,
“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”
2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;
ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,
zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,
ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.
3Mgbe a na-ebibi ntọala niile,
gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
4 Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;
Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.#11:4 Nke a bụ maka ocheeze Onyenwe anyị
Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;
anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.
5 Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,
ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,
ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.
6Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume
dịka mmiri ozuzo;
oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.
7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,
ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;
ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

Currently Selected:

Abụ Ọma 11: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in