YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 33

33
Abụ Ọma 33
Ịdị mma na ịdị ukwuu Onyenwe anyị
1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;
nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.
2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;
werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.
3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;
were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.
4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;
o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.
5 Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;
ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.
6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,
jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
7Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,
kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.
8Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;
ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.
9Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara;
o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.
10 Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile;
ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.
11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha;
bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.
13 Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.
Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.
14O sitere nʼebe obibi ya na-ele
onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.
15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;
ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.
16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;
o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.
17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.
Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.
Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;
ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.
21Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;
nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
22O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,
dịka olileanya anyị dị na gị.

Currently Selected:

Abụ Ọma 33: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in