YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 65

65
Abụ Ọma 65
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ.
Ịdị mma na ịdị ike nke Chineke
1I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn;
ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
2O gị onye na-anụ ekpere,
ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,#65:2 Aịz 66:23
3Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị,
ị gbaghara anyị njehie anyị niile.
4Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara,
ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị!
E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị,
mee ka afọ ju anyị.
5O Chineke, Onye nzọpụta anyị,
i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị,
ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa,
na osimiri niile dị ebe dị anya,
6onye ji ike ya kpụọ ugwu niile,
ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,
7onye mere ka ụda olu oke osimiri niile
na ụda olu ebili mmiri,
na ọgbaaghara mba niile deere duu.
8Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile,
nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada,
ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
9Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri;
ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma.
Isi iyi Chineke adịghị ata ata,
nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi,
nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
10Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị;
ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
11Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze,
ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
12Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ,
e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.
13E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru,
ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile;
ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.

Currently Selected:

Abụ Ọma 65: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in