YouVersion Logo
Search Icon

ỌLU NDI-OZI 8

8
1Ma ob͕ub͕u-ya di Sọl ezi nma.
Oké nsob͕u we puta n'ubọchi ahu megide nzukọ Kraist di na Jerusalem; ha nile we b͕asasia n'ala Judia na Sameria dum, ma-ọbughi ndi-ozi. 2Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá. 3Ma Sọl nēsob͕u nzukọ Kraist nke-uku, nābà n'ulo nile n'otù n'otù, ọ nādọkpu kwa ndikom na ndinyom we rara ha nye ka atubà ha n'ulo-nkpọrọ.
4Ya mere ndi b͕asara jeghariri nēzisa ozi ọma, bú okwu Chineke. 5Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi. 6Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme. 7N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ. 8Oké ọṅù we di n'obodo ahu.
9Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku: 10onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku. 11Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya. 12Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom. 13Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru.
14Ma mb͕e ndi-ozi ndi nọ na Jerusalem nuru na Sameria anarawori okwu Chineke nke-ọma, ha zigara ha Pita na Jọn: 15ndi, mb͕e ha ridatara, ha kpere ekpere bayere ha, ka ha we nara Mọ Nsọ: 16n'ihi na ọ kādakwasighi n'isi onye ọ bula n'etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus. 17Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n'isi, ha we nara Mọ Nsọ. 18Ma mb͕e Saimon huru na anēnye Mọ Nsọ site n'ibikwasi aka nke ndi-ozi, o chere ego n'iru ha, 19si, Nye-kwa-num ike a, ka, onye ọ bula m'gēbikwasi akam abua n'isi, ka o we nara Mọ Nsọ. 20Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n'iyì, n'ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n'ego. 21I nweghi òkè ma-ọbu ihe-nketa n'okwu a: n'ihi na obi-gi ezighi ezi n'iru Chineke. 22Ya mere chègharia n'obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi. 23N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume. 24Saimon we za, si, Unu onwe-unu riọrọm Onye-nwe-ayi, ka ihe ọ bula nime ihe unu kwuworo ghara ibiakwasim.
25Ya mere, mb͕e ha dusiri ọdu kwu kwa okwu Onye-nwe-ayi, ha laghachiri na Jerusalem, nēzisa kwa ozi ọma nye ọtutu obodo ntà ndi Sameria.
26Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n'akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia. 27O we bilie ga: ma le, otù nwoke nke Etiopia, bú onozi nke di ike nke-uku n'okpuru Kandesi, eze-nwanyi ndi Etiopia, onye emere onye-isi àkù-ya nile, onye biarari na Jerusalem ikpọ isi ala nye Chineke; 28o we nālaghachi, nānọdu kwa n'ub͕ọ-ya, nāgu kwa akwukwọ Aisaia onye-amuma. 29Mọ Nsọ we si Filip, Jekuru ub͕ọ-ala ahu, nọnyaba kwa ya nso. 30Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu? 31Ọ si, É-è, n'ihi na #m'gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu. 32Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka,
Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u;
Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji,
Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya:
33Ewepuru ikpé-Ya nime ọnọdu-Ya di ala:
Ònye gākọ ọb͕ọ Ya?
N'ihi na anēwepu ndu-Ya n'uwa.
34Onozi ahu we za Filip, si, Ariọm i, ònye ka onye-amuma nka nēkwu okwu a bayere? ọ̀ bu ya onwe-ya ma-ọbu onye ọzọ di iche? 35Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ. 36Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism? 37Filip we si ya, Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere, agēme gi. O we za, si, Ekwerem na Jisus Kraist bu Ọkpara Chineke. 38O we kwue ka ub͕ọ-ala-ya guzo: ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahu; o we me ya baptism. 39Ma mb͕e ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahughi kwa ya ọzọ, n'ihi na ọ nāga n'uzọ-ya nāṅuri ọṅu. 40Ma ahuru Filip n'Azotọs: mb͕e ọ nāgabiga ọ nēzisa kwa ozi ọma gwa ndi obodo ahu nile, rue mb͕e ọ biaruru Sisaria.

Currently Selected:

ỌLU NDI-OZI 8: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in