YouVersion Logo
Search Icon

ỌPUPU 26

26
1Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha. 2Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile gēnwe. 3Ákwà-nkwuba ise ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya; ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ ganējikọta onwe-ha, otù na ibe-ya. 4I gēji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu; otú a ka i gēme kwa n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua. 5Ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka i gēme kwa nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua; anya-nko gēcherita onwe-ha iru, otù na ibe-ya. 6I gēme kwa ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu ewe buru otù. 7I gēme kwa ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka i gēme ha. 8Ogologo nke otù ákwà-nkwuba gādi orú cubit na iri, obosara nke otù ákwà-nkwuba gādi kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu gēnwe. 9I gējikọta kwa ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche, piaji ákwà-nkwuba nke-isi n'ebe iru ulo-ikwū di. 10I gēme kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, me kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke abua. 11I gēme kwa ọgu nko ọla abua na iri, me ka nko ahu ba n'anya-nko ahu, i we jikọta ulo-ikwū ahu, ọ we buru otù. 12Ma nkwupu nke fọduru nime ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū ahu, bú nkera ákwà-nkwuba nke fọduru, gākwupu n'azu ebe-obibi ahu. 13Cubit ahu nke di n'otù akuku, na cubit ahu nke di n'akuku nke-ọzọ, nime nke fọduru n'ogologo nke ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū, ọ gākwupu n'akuku abua nke ebe-obibi ahu, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ikpuchi ya. 14I gēme-kwa-ra ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya.
15I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ. 16Cubit iri ka ogologo nke otù ibo gādi, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo gādi kwa. 17Otù ibo gēnwe ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka i gēmere ibo nile nke ebe-obibi ahu. 18I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo ahu, orú ibo i gēmere akuku Ndida chere iru na Ndida. 19Ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka i gēme kwa n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua. 20I gēme-kwa-ra akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu, bú akuku Ugwu, orú ibo: 21na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 22Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka i gēme-kwa-ra ibo isi. 23Ibo abua ka i gēme-kwa-ra nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya. 24Ha gābu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua gābu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka ọ gādiri ha abua; nkuku abua ahu ka ha gādiri. 25Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ. 26I gēme kwa nkpọrọ osisi acacia; ise ka i gēmere ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu, 27nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke ebe-obibi, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu. 28Nkpọrọ etiti nke di n'etiti ibo, anēme kwa ya ka o si n'otù nsọtu gabiga rue nsọtu ọzọ. 29I gāmachita kwa ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu: i gāmachita kwa nkpọrọ nile ọla-edo. 30I gēwuli kwa ebe-obibi ahu elu dika ọdidi-ya ekpere n'ikpe si di nke emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a.
31I gēme kwa ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ gābu ọlu onye-ọ̀kà, ọ gēme ya ka o yie cheru-bim: 32i gētiye ya n'elu ide acacia anọ amachitara ọla-edo, nkpọye-ha gābu ọla-edo, n'elu ukwu ọla-ọcha anọ. 33I gētiye kwa ákwà-nb͕ochi ahu n'okpuru nko ahu, i gēbubata kwa n'ebe ahu nime ákwà-nb͕ochi ahu ib͕e ihe-àmà ahu: ákwà-nb͕ochi ahu gākpa-kwa-ra unu ókè n'etiti ebe nsọ ahu na ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile. 34I gētiye kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'elu ib͕e ihe-àmà nime ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile. 35I gādọba table ahu n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu, na ihe-idọba-oriọna ahu na ncherita-iru table n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida: ma table ka i gētiye n'akuku Ugwu. 36I gēme-kwa-ra ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwá-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; ọ gābu ọlu onye-ọdudu-ákwà. 37I gēme-kwa-ra ákwà-nkwuchi ahu ide acacia ise, machita ha ọla-edo; nkpọye-ha gābu ọla-edo: i gāwu-kwa-ra ha ukwu ọla ise.

Currently Selected:

ỌPUPU 26: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in