EZIKIEL 11
11
1Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel. 2Ọ we sim, Nwa nke madu, ndia bu ndikom ahu ndi nēchè ajọ ihe, ndi nādu kwa ọdu ọjọ n'obodo a: 3ndi nāsi, Mb͕e iwu ulo adighi nso: obodo nka bu ite, ayi onwe-ayi bu kwa anu. 4N'ihi nka bue amuma megide ha, bue amuma, nwa nke madu. 5Mọ nke Jehova we dakwasim, O we sim, Si, Otú a ka Jehova siri: Otú a ka unu siri, unu ulo Israel; ọbuná ihe nile nke nābata nime mọ-unu, Mu onwem mara ya. 6Unu emewo ka ndi-unu eb͕uru eb͕u n'obodo a ba uba, unu emejuwo kwa èzí nile ya na ndi eb͕uru eb͕u. 7N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n'etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M'gēme ka unu si nime ya puta. 8Mma-agha ka unu tuworo egwu ya; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 9M'gēme kwa ka unu si n'etiti ya puta, M'gēnye kwa unu n'aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n'ikpe n'etiti unu. 10Site na mma-agha ka unu gāda; n'ókè-ala Israel ka M'gēkpe unu ikpe; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova. 11Obodo nka agaghi-aghọrọ unu ite, unu onwe-unu agaghi-aghọ kwa anu n'etiti ya; n'ókè-ala Israel ka M'gekpe unu ikpe; 12unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na n'ukpurum nile ka unu nējegharighi, ọ bu kwa ihe nile nke M'kpere n'ikpe ka unu nēmeghi, kama ọ bu dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo. 13O rue, mb͕e M'buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M'we da kpue irum n'ala, tie nkpu n'oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme?
14Okwu Jehova we ruem nti, si, 15Nwa nke madu, umu-nne-gi, ọbuná umu-nne-gi, bú ndi-nb͕aputa-gi, na ulo Israel nile, ha nile, ọ bu ha ka ndi bi na Jerusalem siri, Sinu n'ebe Jehova nọ je n'ebe di anya; ọ bu ayi ka enyeworo ala nka ka ọ buru ihe-nnweta: 16n'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ebe M'meworo ka ha je n'ebe di anya n'etiti mba nile, ebe M'chusawo-kwa-ra ha n'ala nile, M'gāghọ-kwa-ra ha ebe nsọ nwa mb͕e ntà n'ala nile ebe ha bàworo. 17N'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchikọputa unu nime ndi nile di iche iche, me kwa ka unu si n'ala nile ebe achusaworo unu zukọta, M'gēnye kwa unu ala Israel. 18Ha gābà kwa n'ebe ahu, ha gēsi kwa na ya wezuga ihe-ya nile jọb͕uru onwe-ha, na ihe-árú-ya nile. 19M'gēnye kwa ha otù obi, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu; M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-ha, nye ha obi anu-aru: 20ka ha we jegharia n'ukpurum nile, debe kwa ikpém nile, me ha: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke. 21Ma ndi obi-ha nējeso obi nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha na ihe-árú nile ha, uzọ-ha ka M'gātukwasi n'isi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. 22Cherubim ahu we chilie nkù-ha, wheel nile ha di kwa n'akuku ha; ebube nke Chineke nke Israel di kwa n'elu ha n'elu. 23Ebube Jehova we si n'etiti obodo ahu rigo, guzo n'elu ugwu ahu nke di n'akuku Iru-anyanwu nke obodo ahu. 24Ma Mọ Chineke bulirim, me ka m'bata na Kaldea biakute ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, n'ọhuhu-ihe ahu nime Mọ Chineke. Ọhuhu-ihe ahu nke m'hururi we si n'ebe m'nọ rigo. 25M'we gwa ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ ihe nile nke Jehova mere ka m'hu.
Currently Selected:
EZIKIEL 11: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

: