YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 10

10
1Ma ndia bu osuso-ọmumu umu-ndikom Noa, bú Shem na Ham na Jefet: amukwara ha umu-ndikom, mb͕e iju-miri ahu gasiri.
2Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras. 3Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Rifat, na Togama. 4Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim. 5Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.
6Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean. 7Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan. 8Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa. 9Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova. 10Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina. 11O siri n'ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala, 12na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu). 13Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim, 14na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.
15Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het; 16na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait; 17na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin; 18na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa. 19Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha. 20Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, nime mba nile ha.
21Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet. 22Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram. 23Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash. 24Apakshad muru Shela; Shela muru Iba. 25Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan. 26Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera; 27na Hadoram, na Uzal, na Dikla; 28na Obal, na Abimael, na Sheba; 29na Ofia, na Havila, na Jobab: ndia nile bu umu-ndikom Jọktan. 30Ebe-obibi-ha we buru site na Misha, mb͕e i nēje Sefa, ugwu nke Iru-anyanwu. 31Ndia bu umu-ndikom Shem, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, dika mba nile ha si di.
32Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Noa, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nime mba nile ha: site kwa na ndia ka ekesara mba nile n'uwa, mb͕e iju-miri ahu gasiri.

Currently Selected:

JENESIS 10: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in