YouVersion Logo
Search Icon

AISAIA 20

20
1N'arọ Tatan biaruru Ashdod, mb͕e Sagon, bú eze Asiria, zitere ya, o we buso Ashdod agha, were ya; 2na mb͕e ahu Jehova kwuru okwu site n'aka Aisaia nwa Emoz, si, Je, tọpu ákwà-nkpe n'úkwù-gi, yipu kwa akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi. O we me otú a, b͕ara ọtọ nējeghari n'ukwu efu. 3Jehova we si, Dika orùm, bú Aisaia, si b͕ara ọtọ nējeghari n'ukwu efu arọ atọ ibu ihe-iriba-ama na ihe-ebube megide Ijipt megide kwa Etiopia; 4otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ. 5Ha ewe tua ujọ, ihere gēme kwa ha, n'ihi Etiopia, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, na n'ihi Ijipt, bú ima-nma-ha. 6Onye bi n'akuku oké osimiri nka gāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, otú a ka ihe-ntukwasi-obi-ayi di, ebe ayi b͕alagaworo ka ewe yere ayi aka inaputa ayi n'aka eze Asiria: òle ebe kwa ka ayi onwe-ayi gēwepuga onwe-ayi?

Currently Selected:

AISAIA 20: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in