YouVersion Logo
Search Icon

JEREMAIA 1

1
1Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim: 2onye okwu Jehova ruru nti n'ubọchi Josaia nwa Emon, bú eze Juda, n'arọ nke-iri-na-atọ ọ bu eze. 3O ru-kwa-ra ya nti n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, rue mb͕e arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia nwa Josaia, bú eze Juda, gwusiri: rue mb͕e emere ka Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'ọnwa nke-ise.
4Okwu Jehova we ruem nti, si, 5Tutu akpua m gi n'afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n'àkpà-nwa puta ka M'doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile. 6M we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, amaghm ikwu okwu, n'ihi na nwata ka m'bu. 7Jehova we sim, Asila, Nwata ka m'bu: n'ihi na ọ bu onye ọ bula M'gēzì gi ka i gējekuru, ọ bu kwa ihe ọ bula M'genye gi n'iwu ka i gēkwu. 8Atula egwu iru-ha: n'ihi na gi ka M'nọyere inaputa gi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 9Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n'ọnu-gi: 10le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n'iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe.
11Okwu Jehova we ruem nti, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Nkpa-n'aka nke osisi almond ka m'nāhu. 12Jehova we sim, I huwo nke-ọma: n'ihi na onye nāmu anya ka M'bu n'ebe okwum di ime ya. 13Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ite afunwuworo ọku n'okpuru ya ka m'nāhu; iru-ya site-kwa-ra n'Ugwu. 14Jehova we sim, N'Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n'ala nka. 15N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda. 16M'gēkwu kwa okwu ikpem nile n'ebe ha nọ bayere ihe ọjọ ha nile; n'ihi na ha arapuwom, we surere chi ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, kpọ kwa isi ala nye ọlu di iche iche nke aka-ha. 17Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n'iwu: atula ujọ ha, ka M'we ghara ime ka i tu ujọ n'iru ha. 18Ma Mu onwem, le, ewerewom i nye ta ibu obodo ewusiri ike, na ibu ide ígwè, na ibu mb͕idi ọla, imegide ala nka nile, imegide eze nile nke Juda, imegide ndi-isi-ya, imegide ndi-nchu-àjà-ya, na imegide ndi ala ahu. 19Ha gēbuso kwa gi agha; ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), inaputa gi.

Currently Selected:

JEREMAIA 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in