YouVersion Logo
Search Icon

JOB 2:11-13

JOB 2:11-13 IGBOB

Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi. Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di. Ha na ya we nānọko n'ala ubọchi asa ehihie na abali, ma ọ dighi onye nāgwa ya okwu; n'ihi na ha huru na o nēb͕u ya nb͕u nke-uku.

Related Videos