YouVersion Logo
Search Icon

JOB 33

33
1Ma otú ọ di, biko, Job, nuru okwum nile,
Ṅa kwa nti okwum nile.
2Biko, le, asaghewom ọnum,
Irem ekwuwo n'okpo-ọnum.
3Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim:
Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n'idi-ọcha.
4Mọ nke Chineke emewom,
Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m'di ndu.
5Ọ buru na i puru, zaghachim;
Do okwu-gi n'usoro n'irum, guzo onwe-gi.
6Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ:
Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.
7Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku,
Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi.
8N'ezie i kwuwo na ntim,
Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,
9Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie;
Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:
10Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa,
Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;
11O nētiye ukwum abua nime ọtọsi,
Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.
12Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi:
N'ihi na Chineke di uku kari madu.
13Gini mere i ji so Ya se okwu,
Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?
14N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu,
E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.
15Na nrọ, bú ọhù nke abali,
Mb͕e oké ura nādakwasi madu,
N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;
16Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,
Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,
17Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,
Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;
18Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,
Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.
19Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya,
Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:
20Nri we nāsọ ndu-ya oyi,
Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.
21Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya;
Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.
22Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,
Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.
23Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya,
Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri,
Igosi madu izi-ezi-ya;
24Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si,
Dọputa ya n'irida n'olùlù,
Achọtawom ihe-nb͕aputa.
25Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwata
Ọ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:
26Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ;
O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya:
O we nyeghachi madu ezi omume-ya.
27Ọ nābù abù n'iru madu, si,
Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume,
Ma ọ baghm n'ihe:
28Ọ b͕aputawo nkpuru-obim n'igabiga ba n'olùlù,
Ndum gēle kwa ìhè.
29Le, ihe ndia nile ka Chineke nālu,
Ub͕ò abua, ma-ọbu ub͕ò atọ, n'ebe madu nọ,
30Ime ka nkpuru-obi-ya si n'olùlù lata,
Ka ewe were ìhè nke ndu nye ya ìhè.
31Job, ṅa nti, gem nti:
B͕a nkiti, na mu onwem gēkwu.
32Ọ buru na okwu adi n'ọnu-gi, zaghachim:
Kwue, n'ihi na ọ dim utọ igu gi n'onye ezi omume.
33Ọ buru na okwu adighi, gi onwe-gi gem nti:
B͕a nkiti, na m'gēzi gi amam-ihe.

Currently Selected:

JOB 33: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in