YouVersion Logo
Search Icon

JOB 4

4
1Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi?
Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n'ikwa okwu?
3Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti,
I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.
4Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike,
I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.
5Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi;
Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.
6Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi?
Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?
7Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ?
Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?
8Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi,
Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.
9Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì,
Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.
10Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja,
Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.
11Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara,
Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.
12Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye,
Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.
13N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali,
Mb͕e oké ura nādakwasi madu,
14Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji,
O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu.
15Otù mọ we gabiga n'irum;
Aji anu-arum we guzo ọtọ.
16Ọ nēguzo eguzo, ma amataghm otú ọ di n'ile ya anya;
Otù udi di n'iru anyam:
Idebe-ọnu-du di, ma olu ka m'nānu, si,
17Madu, ọ̀ gābu onye ezi omume kari Chineke?
Nwòke gādi ọcha kari Onye kèworo ya?
18Le, ọbuná ndi-orù-Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;
Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ nēbo ebubo na ha bu ndi-nmehie:
19Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ?
Nke ntọ-ala-ha di n'ájá,
Ndi anāzọpia azọpia dika nla.
20Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha:
Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.
21Àdopughi udọ̀ ulo-ikwū-ha nime ha?
Ha nānwu, ọ bughi kwa n'amam-ihe.

Currently Selected:

JOB 4: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in