YouVersion Logo
Search Icon

LEVITIKỌS 21

21
1Jehova we si Moses, Gwa ndi-nchu-àjà, bú umu-ndikom Eron, okwu, si ha, Onye-nchu-àjà agaghi-emeru onwe-ya n'ihi madu nwuru anwu n'etiti umu-nna-ya; 2ma-ọbughi nání n'ihi onye-aru-ya, nke di ya nso, n'ihi nne-ya, na n'ihi nna-ya, na n'ihi nwa-ya nwoke, na n'ihi nwa-ya nwayi, na n'ihi nwa-nne-ya nwoke: 3na n'ihi nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke, nke di ya nso, nke ọ dighi mb͕e nwoke luru ya na nwunye, n'ihi ya ka ọ gēmeru onwe-ya. 4Ọ gaghi-emeru onwe-ya, ime onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ, ebe ọ bu onye-nwe madu n'etiti umu-nna-ya. 5Ha agaghi-eme onwe-ha isi-nkwọcha n'isi-ha, ha agaghi-akọpu kwa usọ afu-ọnu-ha, ha agaghi-eb͕u kwa eb͕ub͕u n'anu-aru-ha. 6Ndi nsọ ka ha gāburu Chineke-ha, ha agaghi-eme kwa ka aha Chineke-ha ghara idi nsọ: n'ihi na àjà-ọku Jehova, bú nri Chineke-ha, ka ha onwe-ha nēweta nso: ha gādi kwa nsọ. 7Ha agaghi-aluru nwayi nākwa iko na nwunye, ma-ọbu nwayi nke emeworo ka ọ ghara idi nsọ; ha agaghi-alu kwa nwayi achupuru achupu n'aru di-ya: n'ihi na nsọ ka ọ di n'ebe Chineke-ya nọ. 8I gēdo kwa ya nsọ; n'ihi na nri Chineke-gi ka ya onwe-ya nēweta nso: nsọ ka ọ gādi n'ebe i nọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, Nke nēdo gi nsọ. 9Nwa-nwayi nke onye-nchu-aja ọ bula kwa, mb͕e ọ gēme onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ site n'ikwa iko, nna-ya ka nwanyi ahu nēme ka ọ ghara idi nsọ: n'ọku ka agēsure ya.
10Ma onye-nchu-àjà n'etiti umu-nna-ya, onye awukwasiworo manu nke otite-manu n'isi-ya, onye emejuwo-kwa-ra aka-ya iyiri uwe ahu, ọ gaghi-atọpu agiri-isi-ya, ọ gaghi-adọwa kwa uwe-ya; 11ọ gaghi-abakuru kwa madu nwuru anwu, ọ gaghi-emeru kwa onwe-ya n'ihi nna-ya, ma-ọbu n'ihi nne-ya; 12ọ gaghi-esi kwa n'ebe nsọm pua, ọ gaghi-eme kwa ka ebe nsọ Chineke-ya ghara idi nsọ; n'ihi na nkewapu nke manu nke otite-manu nke Chineke-ya dikwasi ya: Mu onwem bu Jehova. 13Ya onwe-ya gāluru nwunye mb͕e ọ di na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. 14Nwayi-di-ya nwuru, ma-ọbu nke achupuru achupu, ma-ọbu nke emere ka ọ ghara idi nsọ, bú nwayi nākwa iko, ndia ka ọ nāgaghi-aluru na nwunye: ma nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke nke sitere n'umu-nna-ya ka ọ gāluru na nwunye. 15Ọ gaghi-eme kwa ka nkpuru-ya ghara idi nsọ n'etiti umu-nna-ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ya nsọ.
16Jehova we gwa Moses okwu, si, 17Gwa Eron okwu, si, Nwoke ọ bula nke nkpuru-gi rue ọb͕ọ-ha nile nke ọlu di n'aru ya, ya abiarula nso iweta nri Chineke-ya nso. 18N'ihi na nwoke ọ bula nke ọlu di n'aru ya, ọ gaghi-abiaru nso: nwoke nke bu onye-ìsì, ma-ọbu onye-ngwurọ, ma-ọbu nke nwere imi-npia, ma-ọbu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, 19ma-ọbu nwoke nke ukwu kpajiri, akpaji, ma-ọbu aka kpajiri akpaji, di n'aru ya, 20ma-ọbu onye-nkpunkpu-azu, ma-ọbu onye-ùkpọ̀, ma-ọbu nke nwere ntupọ n'anya-ya, ma-ọbu nke àb͕à nāta, ma-ọbu nke nwere ire-ebube, ma-ọbu nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia; 21ọ dighi nwoke ọ bula nke nkpuru Eron onye-nchu-àjà, nke ọlu di n'aru ya, gābiaru nso iweta àjà-ọku Jehova nso: ọlu di n'aru ya; ọ gaghi-abiaru nso iweta nri Chineke-ya nso. 22Nri Chineke-ya, nke sitere n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n'ihe nsọ nile, ka o gēri. 23Nání na ọ gaghabà rue ákwà-nb͕ochim, ọ gaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, n'ihi na ọlu di n'aru ya; ka ọ we ghara ime ka ebe nsọm nile ghara idi nsọ: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ. 24Moses we gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu.

Currently Selected:

LEVITIKỌS 21: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in