YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 14

14
1Nzukọ Israel nile we welie olu-ha, tie nkpu; ndi Israel we kwa ákwá abali ahu. 2Umu Israel nile we tamue ntamu megide Moses, megide kwa Eron: nzukọ ahu nile we si ha, Ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo n'ala Ijipt, ma-ọbu n'ọzara nka! ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo! 3Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Jehova nēme ka ayi ba n'ala nka, ida site na mma-agha? Ndinyom-ayi na umu-ntakiri-ayi gāghọ ihe-nluta-n'agha: ọ̀ gaghi-adi ayi nma ilaghachi n'Ijipt? 4Ha we sirita onwe-ha, Ka ayi me otù onye onye-isi, ka ayi laghachi kwa n'Ijipt. 5Moses na Eron we da kpue iru-ha n'ala n'iru nkpọkọta nile nke nzukọ umu Israel. 6Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha: 7ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku. 8Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. 9Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha. 10Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute.
11Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha? 12M'gēwere ajọ ọria nēfe efe tib͕ue ha, M'gānapu kwa ha ihe ha nwere, M'gēme kwa gi ka i ghọ mba di uku di kwa ike kari ha. 13Moses we si Jehova, Ndi Ijipt gānu kwa ya; n'ihi na I were ike-Gi me ka ndi nka si n'etiti ha rigoputa; 14ha gāgwa kwa ndi bi n'ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n'etiti ndi nka; n'ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n'elu ha, ọ bu kwa n'ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n'iru ha n'ehihie, na n'ogidi ọku n'abali. 15Ma asi na I me ka ndi nka nwua dika otù onye, mba nile ndi nuworo akukọ bayere Gi gēkwu kwa, si, 16N'ihi na Jehova apughi ime ka ndi nka ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru ha iyi inye ha, n'ihi ya ka O b͕uworo ha n'ọzara. 17Ma ub͕u a, biko, ka ike Onye-nwe-ayi di uku, dika I kwuworo, si, 18Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n'ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ. 19Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n'Ijipt we rue ub͕u a. 20Jehova we si, Ab͕agharawom dika okwu-gi si di: 21ma otù ọ di, Mu onwem nādi ndu, uwa nile gējuputa kwa n'ebube Jehova; 22n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti; 23ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, ndi nile nke nēlelìm anya agaghi-ahu kwa ya: 24ma orùm Keleb, n'ihi na mọ di iche nọ n'ime ya, n'ihi kwa na o nēsozum n'azu, M'gēme kwa ka ọ ba n'ala ahu ebe ọ bara; nkpuru-ya gēnweta kwa ya. 25Ma ndi Amalek na ndi Kenean bi na ndagwurugwu a: echi chigharianu, buli-kwa-ra onwe-unu ije je n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie.
26Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 27Rùe ole mb͕e ka M'gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M'nuworo. 28Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M'nāghaghi ime unu: 29n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem, 30unu onwe-unu agaghi-abà n'ala ahu ma-ọli, nke M'buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun. 31Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe-nluta-n'agha, M'gēme kwa ka ha ba, ha gāma kwa ala ahu nke unu juru aju. 32Ma unu onwe-unu, ozu-unu gāda n'ọzara nka. 33Umu-unu gābu kwa ndi-ọzùzù-aturu n'ọzara ọgu arọ abua, ha gēbu kwa ọkwukwa-iko nile unu, rue mb͕e ozu-unu gāgwusi n'ọzara. 34Dika ọnu-ọgugu ubọchi nke unu ji ledo ala ahu anya si di, bú ọgu ubọchi abua, otù ubọchi otù arọ, otù ubochi otù arọ, otù a ka unu gēbu ajọ omume nile unu, ọgu arọ abua, unu gāma kwa iju-ajum. 35Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, nka ka M'nāghaghi imere nzukọ ọjọ a nile, ndi nēzukọ imegidem: n'ọzara nka ka ha gāgwusi, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gānwu. 36Ma ndikom ahu, ndi Moses zigara iledo ala ahu, ndi lata-kwa-ra, me ka nzukọ Israel nile tamu ntamu megide Ya, n'ime ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, 37ọbuná ndikom ahu, bú ndi nēme ka akukọ ọjọ bayere ala ahu puta, nwuru n'ihe-otiti ahu n'iru Jehova. 38Ma Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune di ndu site na ndikom ahu ndi jeworo iledo ala ahu. 39Moses we gwa umu Israel nile okwu ndia: ndi Israel we rue újú nke-uku. 40Ha we bilie n'isi-ututu, rigorue elu ugwu ahu, si, Le ayi, Le ayi, ayi gārigoru kwa ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya: n'ihi na ayi emehiewo. 41Moses we si, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu nāgabiga okwu-ọnu Jehova? ma nke ahu agaghi-aga nke-ọma. 42Unu arigola, n'ihi na Jehova anọghi n'etiti unu; ka ewe ghara itib͕u unu n'iru ndi-iro-unu. 43N'ihi na ndi Amalek na ndi Kenean nọ n'ebe ahu n'iru unu, unu gāda kwa site na mma-agha: n'ihi na unu esiwo n'iso Jehova laghachi, n'ihi ya Jehova agaghi-anọyere unu. 44Ma ha were npako rigorue elu ugwu ahu: ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na Moses, esighi n'etiti ọmuma-ulo-ikwū pua. 45Ndi Amalek we ridata, ha na ndi Kenean, bú ndi bi n'ugwu ahu, ha we tib͕ue ha, tipia kwa ha rue Họma.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in