YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 28

28
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Nye umu Israel iwu, si ha, Onyinyem iji biaru nso, nrim iji chu àjà-ọkum nile, bú ihe ísì utọ nkem, unu gēlezi anya iweta ya nsom na mb͕e-ya akara àkà. 3I gāsi kwa ha, Nka bu àjà-ọku nke unu gēweta nso Jehova; umu-aturu abua nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè, kwa-ubọchi, ibu àjà-nsure-oku anēsure mb͕e dum. 4Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n'ututu, chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n'etiti ehihie na anyasi; 5na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu ka ọ buru onyinye-inata-iru-oma. 6Ọ bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, nke emere n'ugwu Sainai ka ọ buru ihe ísì utọ, bú àjà-ọku anāchuru Jehova. 7Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n'uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n'ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n'anya. 8Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi: dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ibu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere jehova.
9N'ubọchi-izu-ike kwa: umu-aturu abua nke b͕ara otú arọ, nke zuru oké, na uzọ abua n'uzọ iri nke otú ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-oma, nke agwara manu, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya: 10nka bu àjà-nsure-ọku ubọchi-izu-ike kwa-ubọchi-izu-ike, tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
11Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè; 12na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu oke-ehi ọ bula; na uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu otù ebulu; 13na otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu nwa-aturu ọ bula; ọ bu àjà-nsure-ọku, ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova. 14Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ. 15Otù nkpi kwa iji chu àjà-nmehie nye Jehova; agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
16Ọzọ, n'ọwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa, ka ngabiga nke diri Jehova gādi. 17N'ubọchi nke iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe gādi: ubọchi asa ka agēri achicha ekoghi-eko. 18N'ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: 19ma unu gēweta nso àjà-ọku, bú àjà nsure-ọku anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ: nke zuru okè ka ha gāburu unu: 20na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu: uzọ atọ n'uzọ iri ka unu gāchu bayere otù oke-ehi, ọ bu kwa uzọ abua n'uzọ iri ka unu gāchu bayere ebulu ahu; 21ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, ka unu gāchu bayere nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu; 22na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu. 23Unu gāchu ndia nāgughi àjà-nsure-ọku ututu, nke bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum. 24Dika ihe ndia si di ka unu ganāchu kwa-ubọchi, ubọchi asa, nri nke àjà-ọku, nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova: agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà ihe-ọṅuṅu-ya. 25N'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.
26Ọzọ, n'ubọchi nkpuru mbu, mb͕e unu nēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu n'ememe izú asa nke ubọchi asa unu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje: 27unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ; 28na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu otù oke-ehi, uzọ abua n'uzọ iri iji chu otù ebulu ahu, 29otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu; 30otú nkpi, iji kpuchiri unu nmehie-unu. 31Unu gāchu ha nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, (nke zuru okè ka ha gāburu unu), na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 28: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in